1 Chronicles 2

Ụmụ ndị ikom Izrel

1Izrel mụrụ ụmụ ndị ikom ndị a: Ruben, Simiọn, Livayị, Juda, Isaka, na Zebụlọn, 2Dan, Josef, Benjamin, Naftalị, Gad na Asha.

Ndị Juda

Ruokwa ụmụ Hezrọn

3Juda mụtara ụmụ ndị ikom atọ site na nwunye ya Bat-shua, onye Kenan.
Aha ha bụ Ịa, Onan na Shela.
Ma Ịa ọkpara Juda bụ nnọọ mmadụ ọjọọ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi ya, Onyenwe anyị gburu ya.
4Juda mụtakwara ụmụ nwoke abụọ ọzọ, Perez na Zera, site na Tama nwunye nwa ya nwoke.
Ụmụ ndị nwoke niile Juda dị ise.

5Ụmụ ndị ikom Perez bụ,
Hezrọn na Hamul.
6Zera mụrụ:
Zimri, na Etan, na Heman, na Kalkol, na Dara. Ha dị ndị ikom ise nʼọnụọgụgụ.
7Ekan nwa Kami,
bụ onye ahụ tinyere ndị Izrel na nsogbu, site nʼihe o mere nke gbasara ihe e doro nsọ.
8Etan mụrụ
Azaraya.
9Hezrọn mụtara
Jerameel, Ram na Kaleb.

Ụmụ Ram nwa Hezrọn

10Ram mụrụ Aminadab,
Aminadab amụọ Nashọn onyendu a maara ama na Juda.
11Nashọn mụrụ Salma,
Salma amụọ Boaz.
12Boaz amụta Obed,
Obed amụọ Jesi.

13Nwa nwoke mbụ Jesi mụrụ bụ
Eliab; nke abụọ bụ Abinadab,
nke atọ bụ Shimea.
14Nke anọ bụ Netanel,
nke ise bụ Radai,
15nke isii Ozem,
nke asaa Devid.
16Ọ mụkwara ụmụ nwanyị abụọ site nʼaka nwunye ya,
ndị aha ha bụ Zeruaya na Abigel. Zeruaya mụrụ Abishai, na Joab, na Asahel.
17Abigel, nwunye Jeta onye Ishmel mụrụ Amasa.

Kaleb nwa Hezrọn

18Kaleb nwa Hezrọn lụrụ ụmụ nwanyị abụọ, Azuba na Jeriọt. Ọ mụrụ ụmụ ndị ikom ndị a
Jesha, Shobab na Adọn.
19Mgbe Azuba nwụrụ, Kaleb lụrụ nwunye ọzọ. Aha ya bụ Efrat, onye mụtaara ya Hua.
20Hua mụrụ Uri, Uri mụtara Bezalel.

21Mgbe Hezrọn gbara iri afọ isii, ọ lụrụ ada Makia onye mụtaara ya Segub. Makia bụ nna Gilead.
22Segub mụrụ Jaịa, onye chịrị iri obodo abụọ na atọ na Gilead.
23Ma Geshua na Aram dọtara obodo Jaịa nʼagha, dọtakwa Kenat nʼagha, ya na iri obodo nta isii ndị ọzọ gbara ya gburugburu.
Ndị a niile bụ ụmụ Makia nna Gilead.
24Mgbe Hezrọn nwụrụ nʼobodo Kaleb Efrata, Abija nwunye Hezrọn mụtaara ya Ashua, onye bụ nna Tekoa.

Jerameel nwa Hezrọn

25Jerameel ọkpara Hezrọn mụtara Ram, onye bụ ọkpara ya,
mụọkwa Buna, na Oren, na Ozem, na Ahija.
26Nwunye Jerameel nke abụọ, aha ya bụ Atara, mụtara Onam.
27Ram ọkpara Jerameel mụtara ụmụ ndị ikom ndị a:
Maaz, na Jamin, na Eka.
28Ụmụ Onam mụrụ bụ
Shamai, na Jada.
Shamai mụkwara
Nadab, na Abishua.
29Abishua na nwunye ya Abihail mụrụ Aban, na Molid.
30Ụmụ Nadab mụrụ bụ
Seled, na Apaim. Seled nwụrụ na-amụtaghị nwa ọbụla.
31Ma Apaim mụtara Ishi.
Ishi mụrụ Sheshan, Sheshan amụtakwa Alai.
32Jada nwanne Shamai mụtara ụmụ ndị ikom abụọ,
Jeta na Jonatan. Jeta amụtaghị nwa ọbụla,
33ma Jonatan mụtara ụmụ ndị ikom abụọ:
Pelet na Zaza.
Ndị a bụ ụmụ Jerameel.

34Sheshan mụtara ọtụtụ ụmụ nwanyị, ma o nweghị nwa nwoke.
O nwere otu ohu bụ onye Ijipt, aha ya bụ Jaha.
35O weere ada ya nwanyị nye odibo ya bụ Jaha, ka ọ bụrụ nwunye ya. Ọ mụtara ya otu nwa nwoke aha ya bụ Atai.
36Atai mụrụ Netan,
Netan mụrụ Zabad,
37Zabad amụọ Eflal.
Nwa Eflal bụ Obed,
38ma Obed mụrụ Jehu.
Jehu amụọ Azaraya.
39Azaraya bụ nna Helez,
Helez mụrụ Eleasa.
40Eleasa mụrụ Sismai,
Sismai amụọ Shalum.
41Shalum bụ nna Jekamaya,
ebe Jekamaya mụrụ Elishama.

Ikwu Kaleb

42Ụmụ ndị ikom Kaleb nwanne Jerameel bụ
Mesha onye bụ ọkpara ya, nna Zif,
onye mụrụ Maresha nna Hebrọn.
43Hebrọn mụrụ ndị a:
Kora, Tapụọa, Rekem na Shema.
44Shema mụrụ Raham,
onye bụ nna Jokean.
Rekem mụrụ Shamai.
45Ọkpara Shamai bụ Maon,
onye mụrụ Bet Zoa.
46Efaa, iko nwanyị Kaleb,
mụtaara ya Haran, Moza na Gazez.
Haran mụtakwara nwa ọ kpọrọ aha ya Gazez.
47Jadia mụtara ndị ikom ndị a:
Regem, Jotam, Gesham, Pelet, Efaa na Shaaf.
48Maaka, iko nwanyị ọzọ Kaleb nwere mụtaara ya ndị a:
Sheba na Tiahana,
49ọ mụtakwara Shaaf, onye bụ nna Madmanna,
Sheva nna Makbena, tinyere Gibea.
Aha nwa nwanyị Kaleb mụtara bụ Aksa.
50Ndị a bụ ụmụ Kaleb.

Ụmụ Hua, ọkpara Efrata mụrụ bụ,
Shobal, nna Kiriat Jearim,
51Salma nna Betlehem, na Haref, nna Bet-Gadea.
52Ụmụ Shobal nna Kiriat Jearim mụrụ bụ
Haroe, onye mụrụ ọkara ndị ikwu Menuhot.
53Ya mụtakwara ndị ikwu Kiriat Jearim, ndị Itra, ndị Put, ndị Shumat na ndị Mishra. Nʼime ndị a ka ndị Zorat na ndị Eshtaol si pụta.
54Salma mụtara ikwu ndị a:
Betlehem, ndị Netofa, ndị Atrot Bet Joab, ụfọdụ ndị Manaha na ndị Zoa.
55Ụfọdụ ha bụ ikwu ndị ode akwụkwọ, ndị bi nʼobodo Jabez: ndị Tirait, na ndị Shimea, na ndị Suka. Ndị a niile bụ ndị Ken, ndị sitere nʼagbụrụ Hamat, nna ndị ikwu Rekab.
Copyright information for IboBIU